Native Bible

Leviticus 22:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Riekwanụ anụ aja ahụ nʼotu ụbọchị ahụ, ka ọ hapụ ịfọdụ ruo echi ya. Abụ m Onyenwe anyị.

Leviticus 22:30 in English

Leviticus 22:30 · Berean Standard Bible

It must be eaten that same day. Do not leave any of it until morning. I am the LORD.

Context

28Egbula nne anụ na nwa ya nʼotu ụbọchị, maọbụ ehi maọbụ atụrụ.* 29“Mgbe unu na-achụrụ Onyenwe anyị aja ekele, chụọnụ ya nʼụzọ ahụ a ga-anabata ya. 30Riekwanụ anụ aja ahụ nʼotu ụbọchị ahụ, ka ọ hapụ ịfọdụ ruo echi ya. Abụ m Onyenwe anyị. 31“Unu ga-edebe iwu m ndị a niile, mee ha nʼihi na abụ m Onyenwe anyị. 32Unu emekwala ka aha m ghara ịdị nsọ. A ga-edo aha m nsọ nʼetiti ụmụ Izrel, nʼihi na abụ m Onyenwe anyị onye na-edo unu nsọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.