Native Bible

Leviticus 18:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu emekwala ihe arụ ndị a, nʼihi na ọ bụrụ na unu emee ha, ọ ga-emeghe ọnụ ya gbọpụta unu, dịka o si mee mba niile bụ ndị buru unu ụzọ biri nʼime ya.

Leviticus 18:28 in English

Leviticus 18:28 · Berean Standard Bible

So if you defile the land, it will vomit you out as it spewed out the nations before you.

Context

26Unu ga-edebe iwu m na ụkpụrụ m ndị a niile. Unu emekwala ihe arụ ndị a, ma ndị amụrụ nʼala ma ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu. 27Ala m na-aga inye unu rụrụ arụ nʼihi na ndị bi nʼime ya na-eme omume ndị a rụrụ arụ. 28Unu emekwala ihe arụ ndị a, nʼihi na ọ bụrụ na unu emee ha, ọ ga-emeghe ọnụ ya gbọpụta unu, dịka o si mee mba niile bụ ndị buru unu ụzọ biri nʼime ya. 29“ ‘Onye ọbụla nʼetiti unu mere ihe arụ ndị a, ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya. 30Nʼihi ya, lezienụ anya ka unu debe iwu m, ka unu ghara ime ihe arụ ndị a, nke ndị buru unu ụzọ biri nʼala ahụ mere. Ka unu gharakwa imerụ onwe unu site nʼomume arụ ndị a. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ” 18:5 Izk 20:11; Rom 10:5 18:20 Ọpụ 20:14; Mat 5:27-28; 1Kọ 6:9; Hib 13:4 18:21 Lev 20:2-5

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.