Levitikọs 18:26
Leviticus 18:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ga-edebe iwu m na ụkpụrụ m ndị a niile. Unu emekwala ihe arụ ndị a, ma ndị amụrụ nʼala ma ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu.
Leviticus 18:26 in English
Leviticus 18:26 · Berean Standard Bible
But you are to keep My statutes and ordinances, and you must not commit any of these abominations—neither your native-born nor the foreigner who lives among you.
Context
24“ ‘Unu emerụkwala onwe unu site na-ime ihe ndị a, nʼihi na ihe ndị a bụ ihe mba ndị ahụ na-eme. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ga-eji chụpụ ha site nʼala ahụ m ga-enye unu. 25Ọ bụladị ala ahụ niile ghọrọ ihe rụrụ arụ site nʼomume ndị a. Ọ bụ nke a mere m ji ata ndị bi nʼime ya ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ala ahụ meghere ọnụ ya gbọpụta ndị bi nʼime ya. 26Unu ga-edebe iwu m na ụkpụrụ m ndị a niile. Unu emekwala ihe arụ ndị a, ma ndị amụrụ nʼala ma ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu. 27Ala m na-aga inye unu rụrụ arụ nʼihi na ndị bi nʼime ya na-eme omume ndị a rụrụ arụ. 28Unu emekwala ihe arụ ndị a, nʼihi na ọ bụrụ na unu emee ha, ọ ga-emeghe ọnụ ya gbọpụta unu, dịka o si mee mba niile bụ ndị buru unu ụzọ biri nʼime ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.