Native Bible

Leviticus 18:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ị gaghị enye nwa gị ka e jiri ya chụọrọ Molek aja.* Nʼihi na i kwesighị imerụ aha Chineke gị. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

Leviticus 18:21 in English

Leviticus 18:21 · Berean Standard Bible

You must not give any of your children to be sacrificed * to Molech, for you must not profane the name of your God. I am the LORD.

Context

19“ ‘E jekwurukwala nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, mgbe ọ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha nke (ịsọ ụba) nsọ nwanyị ya nʼoge a kara aka. 20“ ‘A kpọrọkwala nwunye onye agbataobi gị idina ya, si otu a merụọ onwe gị nʼihi mmekọ dị otu a.* 21“ ‘Ị gaghị enye nwa gị ka e jiri ya chụọrọ Molek aja.* Nʼihi na i kwesighị imerụ aha Chineke gị. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 22“ ‘Gị na nwoke edinala, dịka nwanyị na nwoke si edina. Ihe akpọrọ asị ka ọ bụ. 23“ ‘Gị na anụmanụ ọbụla edinakwala, site otu a merụọ onwe gị. Nwanyị agakwaghị ewere onwe ya nye ka ya na oke anụmanụ nwee mmekọrịta, arụ a na-adịghị eme eme ka ọ bụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.