Levitikọs 18:19
Leviticus 18:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘E jekwurukwala nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, mgbe ọ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha nke (ịsọ ụba) nsọ nwanyị ya nʼoge a kara aka.
Leviticus 18:19 in English
Leviticus 18:19 · Berean Standard Bible
You must not approach a woman to have sexual relations with her during her menstrual period.
Context
17“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanyị na nwa ya nwanyị ka gị na ha nwe mmekọ edina. Ị gaghị akpọrọ nwa nwanyị nwa ya nwoke, maọbụ nwa nwanyị nke nwa ya nwanyị mụrụ dinaa ya; nʼihi na otu ọbara ka ha bụ. Ihe dị otu a bụ arụ. 18“ ‘Ị gaghị alụ nwanne nwanyị nwunye gị, dịka nwunye ọzọ gị, nʼihi ịkpagbu ya, gị na ya a na-enwe mmekọrịta edina, ị na-ekpughe ọtọ nwunye gị mgbe ọ ka dị ndụ. 19“ ‘E jekwurukwala nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, mgbe ọ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha nke (ịsọ ụba) nsọ nwanyị ya nʼoge a kara aka. 20“ ‘A kpọrọkwala nwunye onye agbataobi gị idina ya, si otu a merụọ onwe gị nʼihi mmekọ dị otu a.* 21“ ‘Ị gaghị enye nwa gị ka e jiri ya chụọrọ Molek aja.* Nʼihi na i kwesighị imerụ aha Chineke gị. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.