Native Bible

Leviticus 17:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye ọbụla bụ onye ụlọ Izrel gbuo ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu nʼogige ebe obibi,* maọbụ nʼazụ ebe obibi,

Leviticus 17:3 in English

Leviticus 17:3 · Berean Standard Bible

‘Anyone from the house of Israel who slaughters an ox,* a lamb, or a goat in the camp or outside of it

Context

1Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 2“Gwa Erọn, na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụ Izrel niile okwu sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. 3Onye ọbụla bụ onye ụlọ Izrel gbuo ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu nʼogige ebe obibi,* maọbụ nʼazụ ebe obibi, 4ma o wetaghị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute iche ya dịka onyinye nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị, a ga-agụ onye ahụ dịka onye ikpe iwufu ọbara mara. Ọ wụfuola ọbara, nʼihi ya, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya. 5Ihe e ji nye iwu a bụ ka ụmụ Izrel wetara Onyenwe anyị aja niile ha na-achụ ugbu a na mbara ezi ọbụla. Ha kwesiri iwetara ya Onyenwe anyị site nʼaka onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, ka o jiri ya chụọrọ ha aja udo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.