Native Bible

Leviticus 17:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ma o wetaghị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute iche ya dịka onyinye nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị, a ga-agụ onye ahụ dịka onye ikpe iwufu ọbara mara. Ọ wụfuola ọbara, nʼihi ya, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya.

Leviticus 17:4 in English

Leviticus 17:4 · Berean Standard Bible

instead of bringing it to the entrance to the Tent of Meeting to present it as an offering to the LORD before His tabernacle—that man shall incur bloodguilt. He has shed blood and must be cut off from among his people.

Context

2“Gwa Erọn, na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụ Izrel niile okwu sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. 3Onye ọbụla bụ onye ụlọ Izrel gbuo ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu nʼogige ebe obibi,* maọbụ nʼazụ ebe obibi, 4ma o wetaghị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute iche ya dịka onyinye nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị, a ga-agụ onye ahụ dịka onye ikpe iwufu ọbara mara. Ọ wụfuola ọbara, nʼihi ya, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya. 5Ihe e ji nye iwu a bụ ka ụmụ Izrel wetara Onyenwe anyị aja niile ha na-achụ ugbu a na mbara ezi ọbụla. Ha kwesiri iwetara ya Onyenwe anyị site nʼaka onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, ka o jiri ya chụọrọ ha aja udo. 6Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-efesa ọbara ahụ nʼebe ịchụ aja dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, kpọọkwa abụba ya ọkụ, ka ọ bụrụ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.