Native Bible

Leviticus 14:53 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ dị ndụ ka o fepụ felaa nʼọhịa dị nʼazụ obodo. Nke a ga-abụ otu e si kpuchiere ụlọ ahụ mmehie ya. Ọ ga-adịkwa ọcha.”

Leviticus 14:53 in English

Leviticus 14:53 · Berean Standard Bible

Finally, he is to release the live bird into the open fields outside the city. In this way he will make atonement for the house, and it will be clean.

Context

51Ọ ga-edenye osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na osisi hisọp ahụ, nʼime ọbara nnụnụ ahụ na mmiri ahụ. Ọ ga-efesa ọbara ahụ nʼụlọ ahụ ugboro asaa. 52Ọ bụ ọbara nnụnụ ahụ, na mmiri ahụ, na nnụnụ nke ọzọ ahụ dị ndụ, na osisi sida ahụ na hisọp ahụ, na ogho uhie ahụ ka ọ ga-eji mee ka ụlọ ahụ dị ọcha. 53Ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ dị ndụ ka o fepụ felaa nʼọhịa dị nʼazụ obodo. Nke a ga-abụ otu e si kpuchiere ụlọ ahụ mmehie ya. Ọ ga-adịkwa ọcha.” 54Ndị a bụ usoro iwu metụtara ọrịa ekpenta, na ọkọ, 55na ọrịa na-efe efe dị nʼuwe maọbụ nʼụlọ,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.