Native Bible

Leviticus 11:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ma ọ dị ụfọdụ ndị na-atagharị nri maọbụ ndị nwere naanị ụkwụ wara njakpa, unu agaghị eri anụ ha. Ha bụ ịnyịnya kamel, ọ bụ ezie na ọ na-atagharị nri, ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Unu agaghị eri ha nʼihi na ọ bụ anụ na-adịghị ọcha.

Leviticus 11:4 in English

Leviticus 11:4 · Berean Standard Bible

But of those that only chew the cud or only have a divided hoof, you are not to eat the following:* The camel, though it chews the cud, does not have a divided hoof; it is unclean for you.

Context

2“Gwanụ ụmụ Izrel, sị, ‘Nʼime anụmanụ niile dị nʼụwa, ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri. 3Unu nwere ike iri anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa.* nke na-atagharị ọnụ.* 4“ ‘Ma ọ dị ụfọdụ ndị na-atagharị nri maọbụ ndị nwere naanị ụkwụ wara njakpa, unu agaghị eri anụ ha. Ha bụ ịnyịnya kamel, ọ bụ ezie na ọ na-atagharị nri, ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Unu agaghị eri ha nʼihi na ọ bụ anụ na-adịghị ọcha. 5Ewi: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu. 6Ewi nkume: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.