Levitikọs 11:21
Leviticus 11:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma e nwere ụfọdụ ụmụ ahụhụ na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ ndị unu nwere ike iri: ndị a bụ ndị nwere ogwe ụkwụ nke ha ji na-awụ awụ nʼala,
Leviticus 11:21 in English
Leviticus 11:21 · Berean Standard Bible
However, you may eat the following kinds of flying insects that walk on all fours: those having jointed legs above their feet for hopping on the ground.
Context
19ụgbala, utù dị iche iche, nnụnụ ọdụ nta* na ụsụ. 20“ ‘Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ bụ ihe rụrụ arụ nye unu, unu agaghị eri ya. 21Ma e nwere ụfọdụ ụmụ ahụhụ na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ ndị unu nwere ike iri: ndị a bụ ndị nwere ogwe ụkwụ nke ha ji na-awụ awụ nʼala, 22ndị a ka unu ga-eri nʼetiti ha, igurube dị iche iche, na akpankwụ dị iche iche, na abụzụ dị iche iche, na ụkpana dị iche iche. 23Ahụhụ ndị ọzọ niile na-efe efe, ndị nwere ụkwụ anọ, bụ ihe rụrụ arụ. Unu ekwesighị iri ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.