Levitikọs 11:23
Leviticus 11:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụhụ ndị ọzọ niile na-efe efe, ndị nwere ụkwụ anọ, bụ ihe rụrụ arụ. Unu ekwesighị iri ha.
Leviticus 11:23 in English
Leviticus 11:23 · Berean Standard Bible
All other flying insects that have four legs are detestable to you.
Context
21Ma e nwere ụfọdụ ụmụ ahụhụ na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ ndị unu nwere ike iri: ndị a bụ ndị nwere ogwe ụkwụ nke ha ji na-awụ awụ nʼala, 22ndị a ka unu ga-eri nʼetiti ha, igurube dị iche iche, na akpankwụ dị iche iche, na abụzụ dị iche iche, na ụkpana dị iche iche. 23Ahụhụ ndị ọzọ niile na-efe efe, ndị nwere ụkwụ anọ, bụ ihe rụrụ arụ. Unu ekwesighị iri ha. 24“ ‘Iri ha ga-eme ka unu rụọ arụọ. Onye ọbụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ site nʼoge o bitụrụ ha aka tutu ruo nʼabalị nke ụbọchị ahụ. 25Onye ọbụla metụrụ otu nʼime ozu ha aka ga-asakwa uwe ya, gụọkwa onwe ya dịka onye na-adịghị ọcha ruo uhuruchi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.