Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo, jikere ịga ibuso ụmụnna ha ahụ agha.

Joshua 22:12 in English

Joshua 22:12 · Berean Standard Bible

And when they heard this, the whole congregation of Israel assembled at Shiloh to go to war against them.

Context

10Mgbe ha rutere Gelilọt dị nʼakụkụ Jọdan, nʼala ndị Kenan, ụmụ Ruben, ndị Gad na ọkara ebo Manase wuru ebe ịchụ aja dị ukwu nʼebe ahụ nʼakụkụ Jọdan. 11Mgbe ndị Izrel nụrụ na ha e wuola ebe ịchụ aja nʼoke ala Kenan, na Gelilọt, nʼebe dị nso Jọdan, nʼofe ala ndị Izrel, 12ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo, jikere ịga ibuso ụmụnna ha ahụ agha. 13Ya mere, ụmụ Izrel zigara Finehaz, nwa Elieza, bụ onye nchụaja ka ọ ga nʼala Gilead, ya bụ ijekwuru ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase. 14Ndị so Finehaz nʼozi a bụ ndị ndu iri. Otu onyendu sitere nʼotu ebo, nʼime ebo iri nke ụmụ Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.