Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ha rutere Gelilọt dị nʼakụkụ Jọdan, nʼala ndị Kenan, ụmụ Ruben, ndị Gad na ọkara ebo Manase wuru ebe ịchụ aja dị ukwu nʼebe ahụ nʼakụkụ Jọdan.

Joshua 22:10 in English

Joshua 22:10 · Berean Standard Bible

And when they came to Geliloth * near the Jordan in the land of Canaan, the Reubenites, the Gadites, and the half-tribe of Manasseh built an imposing altar there by the Jordan.

Context

8“Werenụ ọtụtụ akụ unu lụtara nʼagha laa. Mgbe unu ruru, kenyenụ ndị ikwu unu ụfọdụ ihe site nʼime akụ ndị iro unu a.” Nʼihi na ihe ha kwatara nʼagha dị ukwuu: igwe anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo, na bronz, na igwe, na uwe dị iche iche. 9Ya mere, ndị agha Ruben na Gad, na ọkara ebo Manase, hapụrụ ndị agha Izrel na Shaịlo, nʼime ala Kenan, nʼofe osimiri Jọdan, laghachi nʼala nke ha dị na Gilead, nke ha nwetara dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị. 10Mgbe ha rutere Gelilọt dị nʼakụkụ Jọdan, nʼala ndị Kenan, ụmụ Ruben, ndị Gad na ọkara ebo Manase wuru ebe ịchụ aja dị ukwu nʼebe ahụ nʼakụkụ Jọdan. 11Mgbe ndị Izrel nụrụ na ha e wuola ebe ịchụ aja nʼoke ala Kenan, na Gelilọt, nʼebe dị nso Jọdan, nʼofe ala ndị Izrel, 12ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo, jikere ịga ibuso ụmụnna ha ahụ agha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.