Joshua 22:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị so Finehaz nʼozi a bụ ndị ndu iri. Otu onyendu sitere nʼotu ebo, nʼime ebo iri nke ụmụ Izrel.
Joshua 22:14 in English
Joshua 22:14 · Berean Standard Bible
With him they sent ten chiefs—one family leader from each tribe of Israel, each the head of a family among the clans of Israel.
Context
12ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo, jikere ịga ibuso ụmụnna ha ahụ agha. 13Ya mere, ụmụ Izrel zigara Finehaz, nwa Elieza, bụ onye nchụaja ka ọ ga nʼala Gilead, ya bụ ijekwuru ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase. 14Ndị so Finehaz nʼozi a bụ ndị ndu iri. Otu onyendu sitere nʼotu ebo, nʼime ebo iri nke ụmụ Izrel. 15Mgbe ndị a rutere nʼala Gilead, ha kpọkọtara ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase gwa ha okwu sị, 16“Otu a ka ọgbakọ niile nke Onyenwe anyị sịrị, ‘Olee ụdị njehie dị nke a, nke unu mere megide Chineke? Olee otu unu si wezuga onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ, gaa wuore onwe unu ebe ịchụ aja, si otu a nupu isi megide ya?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.