Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị a bụ ndị eze ala ndị ahụ ndị Izrel lara nʼiyi, bụ ala ndị ahụ ha nwetara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Obodo niile a lara nʼiyi bụ ndị dị site na ndagwurugwu iyi Anọn ruo nʼugwu Hemon ha na akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba.

Joshua 12:1 in English

Joshua 12:1 · Berean Standard Bible

Now these are the kings of the land whom the Israelites struck down and whose lands they took beyond the Jordan to the east, from the Arnon Valley to Mount Hermon, including all the Arabah eastward:

Context

1Ndị a bụ ndị eze ala ndị ahụ ndị Izrel lara nʼiyi, bụ ala ndị ahụ ha nwetara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Obodo niile a lara nʼiyi bụ ndị dị site na ndagwurugwu iyi Anọn ruo nʼugwu Hemon ha na akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba. 2Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn. Ala ya gbatịrị site nʼAroea, nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn, na nʼetiti ndagwurugwu iyi Anọn, ruo iyi Jabọk, nke bụ oke ala ụmụ Amọn. Ọkara ala Gilead, nke dị nʼugwu iyi Jabọk bụkwa ala ya. 3Ọ bụkwa Saịhọn na-achị akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba site nʼosimiri Kineret ruo nʼosimiri Araba (ya bụ, Osimiri Nnu), ruo Bet-Jeshimọt, gbadaakwa akụkụ ndịda ndịda ruo na mgbada ugwu Pisga.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.