Joshua 12
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Ndị a bụ ndị eze ala ndị ahụ ndị Izrel lara nʼiyi, bụ ala ndị ahụ ha nwetara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Obodo niile a lara nʼiyi bụ ndị dị site na ndagwurugwu iyi Anọn ruo nʼugwu Hemon ha na akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba. 2Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn.
Ala ya gbatịrị site nʼAroea, nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn, na nʼetiti ndagwurugwu iyi Anọn, ruo iyi Jabọk, nke bụ oke ala ụmụ Amọn. Ọkara ala Gilead, nke dị nʼugwu iyi Jabọk bụkwa ala ya. 3Ọ bụkwa Saịhọn na-achị akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba site nʼosimiri Kineret ruo nʼosimiri Araba (ya bụ, Osimiri Nnu), ruo Bet-Jeshimọt, gbadaakwa akụkụ ndịda ndịda ruo na mgbada ugwu Pisga. 4Ha merikwara Ọg, eze Bashan, onye bụ otu nʼime ndị eze ikpeazụ ndị agbụrụ Refaim. Isi alaeze ya dị nʼAshtarọt na Edrei. 5Ọ chịrị nʼugwu Hemon, Saleka, ala Bashan niile ruo nʼoke ha na ndị Geshua na Maaka nwere, nakwa ọkara nke Gilead, bụ oke ala Saịhọn, bụ eze Heshbọn. 6Ọ bụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị, na ụmụ Izrel, lara eze abụọ ndị a nʼiyi. Mosis nyekwara ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase ala ha. 7Ndị a bụ aha ndị eze niile Joshua na ụmụ Izrel meriri, nʼofe osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site na Baal-Gad nke dị na ndagwurugwu Lebanọn, ruo nʼugwu Halak nke dị na mgbago nʼụzọ Sia. Joshua nyere ebo Izrel niile ala ha ndị a dịka ihe nketa, nʼusoro dịka ebo ha si dị. 8Ala ndị ọzọ bụkwa ala ugwu ugwu ahụ, na ala dị na mgbada ugwu ọdịda anyanwụ, na ala Araba, na ala ndị dị na mgbada ugwu, na ọzara, nakwa Negev. Ndị a bụ ala ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Kenan, ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus.
Ndị a bụ ndị eze ahụ: 9Eze Jeriko, otu
eze Ai (nke dị nso na Betel), otu 10eze Jerusalem, otu
eze Hebrọn, otu 11Eze Jamut, otu
eze Lakish, otu 12eze Eglọn, otu
eze Gaza, otu 13eze Debịa, otu
eze Geda, otu 14eze Homa, otu
eze Arad, otu 15eze Libna, otu
eze Adulam, otu 16eze Makeda, otu
eze Betel, otu 17eze Tapụọa, otu
eze Hefa, otu 18eze Afek, otu
eze Lasharọn, otu 19eze Madọn, otu
eze Hazọ, otu 20eze Shịmrọn Meron, otu
eze Akshaf, otu 21eze Teanak, otu
eze Megido, otu 22eze Kedesh, otu
eze Jokneam, nʼime Kamel, otu 23eze Doa, (nʼime obodo Naftod), otu
eze Goiim, nʼime Gilgal,* otu
na 24eze Tịaza, otu.
Ha niile dị ndị eze iri atọ na otu.
12:23 Ka o doo anyị anya nʼobodo Gilgal nke a, abụghị otu ihe ya na nke dị nso nʼobodo Jeriko.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.