Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị, na ụmụ Izrel, lara eze abụọ ndị a nʼiyi. Mosis nyekwara ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase ala ha.

Joshua 12:6 in English

Joshua 12:6 · Berean Standard Bible

Moses, the servant of the LORD, and the Israelites had struck them down and given their land as an inheritance to the Reubenites, the Gadites, and the half-tribe of Manasseh.

Context

4Ha merikwara Ọg, eze Bashan, onye bụ otu nʼime ndị eze ikpeazụ ndị agbụrụ Refaim. Isi alaeze ya dị nʼAshtarọt na Edrei. 5Ọ chịrị nʼugwu Hemon, Saleka, ala Bashan niile ruo nʼoke ha na ndị Geshua na Maaka nwere, nakwa ọkara nke Gilead, bụ oke ala Saịhọn, bụ eze Heshbọn. 6Ọ bụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị, na ụmụ Izrel, lara eze abụọ ndị a nʼiyi. Mosis nyekwara ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase ala ha. 7Ndị a bụ aha ndị eze niile Joshua na ụmụ Izrel meriri, nʼofe osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site na Baal-Gad nke dị na ndagwurugwu Lebanọn, ruo nʼugwu Halak nke dị na mgbago nʼụzọ Sia. Joshua nyere ebo Izrel niile ala ha ndị a dịka ihe nketa, nʼusoro dịka ebo ha si dị. 8Ala ndị ọzọ bụkwa ala ugwu ugwu ahụ, na ala dị na mgbada ugwu ọdịda anyanwụ, na ala Araba, na ala ndị dị na mgbada ugwu, na ọzara, nakwa Negev. Ndị a bụ ala ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Kenan, ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Ndị a bụ ndị eze ahụ:

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.