Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ chịrị nʼugwu Hemon, Saleka, ala Bashan niile ruo nʼoke ha na ndị Geshua na Maaka nwere, nakwa ọkara nke Gilead, bụ oke ala Saịhọn, bụ eze Heshbọn.

Joshua 12:5 in English

Joshua 12:5 · Berean Standard Bible

He ruled over Mount Hermon, Salecah, all of Bashan up to the border of the Geshurites and Maacathites, and half of Gilead to the border of Sihon king of Heshbon.

Context

3Ọ bụkwa Saịhọn na-achị akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba site nʼosimiri Kineret ruo nʼosimiri Araba (ya bụ, Osimiri Nnu), ruo Bet-Jeshimọt, gbadaakwa akụkụ ndịda ndịda ruo na mgbada ugwu Pisga. 4Ha merikwara Ọg, eze Bashan, onye bụ otu nʼime ndị eze ikpeazụ ndị agbụrụ Refaim. Isi alaeze ya dị nʼAshtarọt na Edrei. 5Ọ chịrị nʼugwu Hemon, Saleka, ala Bashan niile ruo nʼoke ha na ndị Geshua na Maaka nwere, nakwa ọkara nke Gilead, bụ oke ala Saịhọn, bụ eze Heshbọn. 6Ọ bụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị, na ụmụ Izrel, lara eze abụọ ndị a nʼiyi. Mosis nyekwara ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase ala ha. 7Ndị a bụ aha ndị eze niile Joshua na ụmụ Izrel meriri, nʼofe osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site na Baal-Gad nke dị na ndagwurugwu Lebanọn, ruo nʼugwu Halak nke dị na mgbago nʼụzọ Sia. Joshua nyere ebo Izrel niile ala ha ndị a dịka ihe nketa, nʼusoro dịka ebo ha si dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.