Joshua 11:13
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ndị Izrel esughị obodo ọbụla nʼime ndị ahụ niile e wuru na mkputamkpu ala ọkụ, karịakwa obodo Hazọ, nke Joshua kpọrọ ọkụ.
Joshua 11:13 in English
Joshua 11:13 · Berean Standard Bible
Yet Israel did not burn any of the cities built on their mounds, except Hazor, which Joshua burned.
Context
11Ha ji mma agha gbuo ndị niile bi nʼobodo ahụ, bibie ha kpamkpam, ọ dịghị onye a hapụrụ nke na-eku ume. O sukwara Hazọ ọkụ. 12Joshua weere obodo niile nke ndị eze ahụ na ndị eze ha niile,* jiri mma agha gbuchapụ ha. Ọ lakwara ha niile nʼiyi, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere nʼiwu. 13Ma ndị Izrel esughị obodo ọbụla nʼime ndị ahụ niile e wuru na mkputamkpu ala ọkụ, karịakwa obodo Hazọ, nke Joshua kpọrọ ọkụ. 14Ihe niile a kwatara nʼagha nʼobodo ndị a, na anụ ụlọ ha niile, ka ndị Izrel weere. Ma ha gburu mmadụ niile. Ha ahapụghị ọ bụladị otu onye ndụ. 15Nʼihi na nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis onyeozi ya. Mosis nyekwara Joshua otu iwu a. Ugbu a Joshua emeela dịka a gwara ya. O mezuru ihe ndị a niile, bụ nke Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.