Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe niile a kwatara nʼagha nʼobodo ndị a, na anụ ụlọ ha niile, ka ndị Izrel weere. Ma ha gburu mmadụ niile. Ha ahapụghị ọ bụladị otu onye ndụ.

Joshua 11:14 in English

Joshua 11:14 · Berean Standard Bible

The Israelites took for themselves all the plunder and livestock of these cities, but they put all the people to the sword until they had completely destroyed them, not sparing anyone who breathed.

Context

12Joshua weere obodo niile nke ndị eze ahụ na ndị eze ha niile,* jiri mma agha gbuchapụ ha. Ọ lakwara ha niile nʼiyi, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere nʼiwu. 13Ma ndị Izrel esughị obodo ọbụla nʼime ndị ahụ niile e wuru na mkputamkpu ala ọkụ, karịakwa obodo Hazọ, nke Joshua kpọrọ ọkụ. 14Ihe niile a kwatara nʼagha nʼobodo ndị a, na anụ ụlọ ha niile, ka ndị Izrel weere. Ma ha gburu mmadụ niile. Ha ahapụghị ọ bụladị otu onye ndụ. 15Nʼihi na nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis onyeozi ya. Mosis nyekwara Joshua otu iwu a. Ugbu a Joshua emeela dịka a gwara ya. O mezuru ihe ndị a niile, bụ nke Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 16Ya mere, Joshua meriri ala ahụ niile, bụ ala ugwu ugwu ahụ, na ala Negeb, na ala Goshen, na obosara ala ọdịda anyanwụ ahụ niile, na ala Araba, na ala ugwu ahụ niile, na ala ahụ dị na mgbada ugwu Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.