Joshua 10:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma nʼoge ahụ a na-alụ agha ahụ, ndị eze ise ahụ si nʼọgbọ agha gbapụ, zoo onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda.
Joshua 10:16 in English
Joshua 10:16 · Berean Standard Bible
Now the five kings had fled and hidden in the cave at Makkedah.
Context
14O nweghị ụbọchị ọzọ dịka ụbọchị ahụ nʼoge niile gara aga. Ọ dịbekwaghị ụbọchị yiri ụbọchị ahụ ruo taa. Ọ bụ ụbọchị Onyenwe anyị mere ka anyanwụ na ọnwa kwụsị, nʼihi naanị ekpere otu nwoke. Nʼihi na Onyenwe anyị na-eburu Izrel agha. 15Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu dị na Gilgal. 16Ma nʼoge ahụ a na-alụ agha ahụ, ndị eze ise ahụ si nʼọgbọ agha gbapụ, zoo onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda. 17Mgbe ozi ruru Joshua ntị, na a chọtala eze ise ndị ahụ, ebe ha zoro onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda, 18Joshua nyere iwu sị, “Werenụ nkume buru ibu mechie ọnụ ọgba nkume ahụ. Debekwanụ ndị nche nʼebe ahụ, ka ha chee ndị eze ahụ nche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.