Joshua 10:15
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu dị na Gilgal.
Joshua 10:15 in English
Joshua 10:15 · Berean Standard Bible
Then Joshua returned with all Israel to the camp at Gilgal.
Context
13Anyanwụ guzoro,
ọnwa guzokwa.
Ha abụọ adaghị tutu ruo mgbe ndị agha mba ahụ gbuchasịrị ndị iro ha.
Ihe banyere akụkọ agha a ka e dere nʼakwụkwọ Jasha.
Ya mere, anyanwụ guzoro nʼotu ebe nʼetiti mbara eluigwe. Ọ nọkwa nʼotu ebe ihe dịka otu ụbọchị zuru ezu. 14O nweghị ụbọchị ọzọ dịka ụbọchị ahụ nʼoge niile gara aga. Ọ dịbekwaghị ụbọchị yiri ụbọchị ahụ ruo taa. Ọ bụ ụbọchị Onyenwe anyị mere ka anyanwụ na ọnwa kwụsị, nʼihi naanị ekpere otu nwoke. Nʼihi na Onyenwe anyị na-eburu Izrel agha. 15Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu dị na Gilgal. 16Ma nʼoge ahụ a na-alụ agha ahụ, ndị eze ise ahụ si nʼọgbọ agha gbapụ, zoo onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda. 17Mgbe ozi ruru Joshua ntị, na a chọtala eze ise ndị ahụ, ebe ha zoro onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.