Juel 3:2
Joel 3:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na m ga-achịkọta mba niile nke ụwa, mee ka ha zukọọ na Ndagwurugwu Jehoshafat.* Nʼebe ahụ, ka mụ onwe m ga-ama ha ikpe, nʼihi ihe ha mere ihe nketa m, na ndị nke m Izrel. Nʼihi na ha chụsasịrị ndị m nʼetiti mba niile, kee ala m nʼetiti onwe ha.
Joel 3:2 in English
Joel 3:2 · Berean Standard Bible
I will gather all the nations and bring them down to the Valley of Jehoshaphat.* There I will enter into judgment against them concerning My people, My inheritance, Israel, whom they have scattered among the nations as they divided up My land.
Context
1“Nʼihi na, lee, nʼụbọchị ahụ, nʼoge ahụ,
mgbe m ga-eweghachi akụnụba nke Juda na Jerusalem, 2na m ga-achịkọta mba niile nke ụwa,
mee ka ha zukọọ na Ndagwurugwu Jehoshafat.*
Nʼebe ahụ, ka mụ onwe m ga-ama ha ikpe,
nʼihi ihe ha mere ihe nketa m, na ndị nke m Izrel.
Nʼihi na ha chụsasịrị ndị m nʼetiti mba niile,
kee ala m nʼetiti onwe ha. 3Ha fere nza nʼihi ndị m,
were ụmụ m ndị nwoke gbanwere ụmụ akwụna.
Ha rere ụmụ m ndị nwanyị nʼihi mmanya, nʼihi inweta mmanya ha ga-aṅụ. 4“Ọ bụ gịnị ka unu nwere megide m, unu Taịa na Saịdọn, na unu obodo ahụ niile dị gburugburu ala ndị Filistia? O nwere ihe m mere nke unu na-akwụghachi m ụgwọ ya? Ọ bụrụ nʼezie na unu na-akwụghachi m ụgwọ, mụ onwe m ga-eji ọsọ kwụghachi unu ihe ọjọọ niile unu mere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.