Juel 3:1
Joel 3:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi na, lee, nʼụbọchị ahụ, nʼoge ahụ, mgbe m ga-eweghachi akụnụba nke Juda na Jerusalem,
Joel 3:1 in English
Joel 3:1 · Berean Standard Bible
“Yes, in those days and at that time, when I restore Judah and Jerusalem from captivity,*
Context
1“Nʼihi na, lee, nʼụbọchị ahụ, nʼoge ahụ,
mgbe m ga-eweghachi akụnụba nke Juda na Jerusalem, 2na m ga-achịkọta mba niile nke ụwa,
mee ka ha zukọọ na Ndagwurugwu Jehoshafat.*
Nʼebe ahụ, ka mụ onwe m ga-ama ha ikpe,
nʼihi ihe ha mere ihe nketa m, na ndị nke m Izrel.
Nʼihi na ha chụsasịrị ndị m nʼetiti mba niile,
kee ala m nʼetiti onwe ha. 3Ha fere nza nʼihi ndị m,
were ụmụ m ndị nwoke gbanwere ụmụ akwụna.
Ha rere ụmụ m ndị nwanyị nʼihi mmanya, nʼihi inweta mmanya ha ga-aṅụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.