Juel 1:3
Joel 1:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gwanụ ya ụmụ unu, ka ụmụ unu gwakwa ụmụ ha, ka ụmụ ha gwakwa ụmụ ụmụ ha, ka ụmụ ụmụ ha gwakwa ọgbọ nke na-eso ha.
Joel 1:3 in English
Joel 1:3 · Berean Standard Bible
Tell it to your children; let your children tell it to their children, and their children to the next generation.
Context
1Okwu Onyenwe anyị nke bịakwutere Juel nwa Petuel. 2Nụrụnụ nke a, unu ndị okenye;
geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼala a.
Ihe dị otu a o meela na ndụ unu,
ka o mere na ndụ nna nna unu ha? 3Gwanụ ya ụmụ unu,
ka ụmụ unu gwakwa ụmụ ha, ka ụmụ ha gwakwa ụmụ ụmụ ha,
ka ụmụ ụmụ ha gwakwa ọgbọ nke na-eso ha. 4Ihe igurube rifọrọ
ka igurube ukwu richara,
ihe igurube ukwu rifọrọ,
ka ụmụ igurube richara,
ihe ụmụ igurube rifọrọ
ka igurube ndị ọzọ richapụrụ. 5Tetanụ, unu ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Kwaanụ akwa.
Kwaanụ akwa unu ndị na-aṅụ mmanya;
kwaanụ akwa nʼihi mmanya ọhụrụ,
nʼihi na e sitela nʼọnụ unu napụ unu mmanya unu na-aṅụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.