Juel 1:4
Joel 1:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe igurube rifọrọ ka igurube ukwu richara, ihe igurube ukwu rifọrọ, ka ụmụ igurube richara, ihe ụmụ igurube rifọrọ ka igurube ndị ọzọ richapụrụ.
Joel 1:4 in English
Joel 1:4 · Berean Standard Bible
What the devouring locust has left, the swarming locust has eaten; what the swarming locust has left, the young locust has eaten; and what the young locust has left, the destroying locust has eaten.*
Context
2Nụrụnụ nke a, unu ndị okenye;
geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼala a.
Ihe dị otu a o meela na ndụ unu,
ka o mere na ndụ nna nna unu ha? 3Gwanụ ya ụmụ unu,
ka ụmụ unu gwakwa ụmụ ha, ka ụmụ ha gwakwa ụmụ ụmụ ha,
ka ụmụ ụmụ ha gwakwa ọgbọ nke na-eso ha. 4Ihe igurube rifọrọ
ka igurube ukwu richara,
ihe igurube ukwu rifọrọ,
ka ụmụ igurube richara,
ihe ụmụ igurube rifọrọ
ka igurube ndị ọzọ richapụrụ. 5Tetanụ, unu ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Kwaanụ akwa.
Kwaanụ akwa unu ndị na-aṅụ mmanya;
kwaanụ akwa nʼihi mmanya ọhụrụ,
nʼihi na e sitela nʼọnụ unu napụ unu mmanya unu na-aṅụ. 6O nwere mba bịakwasịrị ala m,
usuu ndị agha nke na-enweghị ịgụta ọnụ;
nke nwere eze dịka ọdụm,
nweekwa ikiri eze dịka ka nne ọdụm.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.