Juel 1:18
Joel 1:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee otu anụ ụlọ niile si eze ume! Igwe ehi na-awagharị nʼihi na ha enweghị ebe ịta nri; ọ bụladị igwe atụrụ nọkwa nʼọnọdụ ịta ahụhụ.
Joel 1:18 in English
Joel 1:18 · Berean Standard Bible
How the cattle groan! The herds wander in confusion because they have no pasture. Even the flocks of sheep are suffering.
Context
16Ọ bụ na e sitebeghị nʼihu anyị
wezuga ihe oriri niile,
Ọ bụ na ọṅụ na obi ụtọ e sitebeghị
nʼụlọnsọ Chineke anyị pụọ? 17Mkpụrụ ubi
akpọnwụọla nʼọkpụrụkpụ aja ala.
Ụlọ a na-edebe ihe oriri atọgbọrọla nʼefu,
a kwatuola ọba niile,
nʼihi na mkpụrụ ọka niile akpọọla nku. 18Lee otu anụ ụlọ niile si eze ume!
Igwe ehi na-awagharị
nʼihi na ha enweghị ebe ịta nri;
ọ bụladị igwe atụrụ nọkwa nʼọnọdụ ịta ahụhụ. 19Gị Onyenwe anyị, ka m na-akpọku,
nʼihi na ọkụ erepịala ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ.
Ọkụ erechapụkwala osisi niile dị nʼọhịa. 20Ọ bụladị ụmụ anụ ọhịa na-ebeku gị akwa,
nʼihi na iyi niile ataala,
ọkụ erechapụkwala ebe ịta nri nke anụmanụ niile nke dị nʼọzara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.