Native Bible

Joel 1:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee otu anụ ụlọ niile si eze ume! Igwe ehi na-awagharị nʼihi na ha enweghị ebe ịta nri; ọ bụladị igwe atụrụ nọkwa nʼọnọdụ ịta ahụhụ.

Joel 1:18 in English

Joel 1:18 · Berean Standard Bible

How the cattle groan! The herds wander in confusion because they have no pasture. Even the flocks of sheep are suffering.

Context

16Ọ bụ na e sitebeghị nʼihu anyị wezuga ihe oriri niile, Ọ bụ na ọṅụ na obi ụtọ e sitebeghị nʼụlọnsọ Chineke anyị pụọ? 17Mkpụrụ ubi akpọnwụọla nʼọkpụrụkpụ aja ala. Ụlọ a na-edebe ihe oriri atọgbọrọla nʼefu, a kwatuola ọba niile, nʼihi na mkpụrụ ọka niile akpọọla nku. 18Lee otu anụ ụlọ niile si eze ume! Igwe ehi na-awagharị nʼihi na ha enweghị ebe ịta nri; ọ bụladị igwe atụrụ nọkwa nʼọnọdụ ịta ahụhụ. 19Gị Onyenwe anyị, ka m na-akpọku, nʼihi na ọkụ erepịala ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ. Ọkụ erechapụkwala osisi niile dị nʼọhịa. 20Ọ bụladị ụmụ anụ ọhịa na-ebeku gị akwa, nʼihi na iyi niile ataala, ọkụ erechapụkwala ebe ịta nri nke anụmanụ niile nke dị nʼọzara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.