Juel 1:19
Joel 1:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị Onyenwe anyị, ka m na-akpọku, nʼihi na ọkụ erepịala ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ. Ọkụ erechapụkwala osisi niile dị nʼọhịa.
Joel 1:19 in English
Joel 1:19 · Berean Standard Bible
To You, O LORD, I call, for fire has consumed the open pastures and flames have scorched all the trees of the field.
Context
17Mkpụrụ ubi
akpọnwụọla nʼọkpụrụkpụ aja ala.
Ụlọ a na-edebe ihe oriri atọgbọrọla nʼefu,
a kwatuola ọba niile,
nʼihi na mkpụrụ ọka niile akpọọla nku. 18Lee otu anụ ụlọ niile si eze ume!
Igwe ehi na-awagharị
nʼihi na ha enweghị ebe ịta nri;
ọ bụladị igwe atụrụ nọkwa nʼọnọdụ ịta ahụhụ. 19Gị Onyenwe anyị, ka m na-akpọku,
nʼihi na ọkụ erepịala ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ.
Ọkụ erechapụkwala osisi niile dị nʼọhịa. 20Ọ bụladị ụmụ anụ ọhịa na-ebeku gị akwa,
nʼihi na iyi niile ataala,
ọkụ erechapụkwala ebe ịta nri nke anụmanụ niile nke dị nʼọzara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.