Juel 1:17
Joel 1:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mkpụrụ ubi akpọnwụọla nʼọkpụrụkpụ aja ala. Ụlọ a na-edebe ihe oriri atọgbọrọla nʼefu, a kwatuola ọba niile, nʼihi na mkpụrụ ọka niile akpọọla nku.
Joel 1:17 in English
Joel 1:17 · Berean Standard Bible
The seeds lie shriveled beneath the clods; the storehouses are in ruins; the granaries are broken down, for the grain has withered away.
Context
15Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ bụ!
Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị abịala nso.
Ọ ga-ewetakwa mbibi site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile. 16Ọ bụ na e sitebeghị nʼihu anyị
wezuga ihe oriri niile,
Ọ bụ na ọṅụ na obi ụtọ e sitebeghị
nʼụlọnsọ Chineke anyị pụọ? 17Mkpụrụ ubi
akpọnwụọla nʼọkpụrụkpụ aja ala.
Ụlọ a na-edebe ihe oriri atọgbọrọla nʼefu,
a kwatuola ọba niile,
nʼihi na mkpụrụ ọka niile akpọọla nku. 18Lee otu anụ ụlọ niile si eze ume!
Igwe ehi na-awagharị
nʼihi na ha enweghị ebe ịta nri;
ọ bụladị igwe atụrụ nọkwa nʼọnọdụ ịta ahụhụ. 19Gị Onyenwe anyị, ka m na-akpọku,
nʼihi na ọkụ erepịala ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ.
Ọkụ erechapụkwala osisi niile dị nʼọhịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.