Juel 1:15
Joel 1:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ bụ! Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị abịala nso. Ọ ga-ewetakwa mbibi site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.
Joel 1:15 in English
Joel 1:15 · Berean Standard Bible
Alas for the day! For the Day of the LORD is near, and it will come as destruction from the Almighty.*
Context
13Yikwasịnụ onwe unu akwa mkpe, unu ndị nchụaja; ruonụ ụjụ,
kwaanụ akwa, unu ndị na-eje ozi nʼebe ịchụ aja.
Bịanụ, yiri akwa mkpe nọ ọnọdụ abalị
unu ndị na-ejere Chineke m ozi
nʼihi na egbochiela onyinye ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ
ịbata nʼụlọ Chineke unu. 14Kpọsaanụ obubu ọnụ dị nsọ.
Kpọọnụ nzukọta dị nsọ.
Chịkọtaanụ ndị okenye
na ndị niile bi nʼala a,
ka ha bịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị Chineke unu;
ka ha tikuo Onyenwe anyị mkpu akwa. 15Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ bụ!
Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị abịala nso.
Ọ ga-ewetakwa mbibi site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile. 16Ọ bụ na e sitebeghị nʼihu anyị
wezuga ihe oriri niile,
Ọ bụ na ọṅụ na obi ụtọ e sitebeghị
nʼụlọnsọ Chineke anyị pụọ? 17Mkpụrụ ubi
akpọnwụọla nʼọkpụrụkpụ aja ala.
Ụlọ a na-edebe ihe oriri atọgbọrọla nʼefu,
a kwatuola ọba niile,
nʼihi na mkpụrụ ọka niile akpọọla nku.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.