Juel 1:10
Joel 1:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emebiela ala ubi niile, ala nọ na-eru ụjụ. Ebibiela ọka niile, mmanya adịghịkwa, otu a kwa, mmanụ oliv adịghịkwa.
Joel 1:10 in English
Joel 1:10 · Berean Standard Bible
The field is ruined; the land mourns. For the grain is destroyed, the new wine is dried up, and the oil fails.
Context
8Kwaa akwa mwute dịka nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,
nke di na-aga ịlụ ya nwụrụ. 9Akwụsịla iwebata onyinye ọka na onyinye mmanya
nʼụlọ Onyenwe anyị.
Ndị nchụaja na-eru ụjụ,
bụ ndị ahụ na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị. 10Emebiela ala ubi niile,
ala nọ na-eru ụjụ.
Ebibiela ọka niile,
mmanya adịghịkwa,
otu a kwa, mmanụ oliv adịghịkwa. 11Daanụ mba nʼobi unu, unu ndị ọrụ ubi,
tienụ mkpu akwa, unu ndị ọrụ ubi vaịnị.
Tienụ aka nʼobi nʼihi ọka wiiti na ọka balị,
nʼihi na a laala owuwe ihe ubi nʼiyi. 12Osisi vaịnị anwụọla.
Osisi fiig akpọnwụọla.
Osisi pomegranet na osisi nkwụ, na osisi apụl akpọnwụọla.
Nʼezie, osisi niile akpọnwụọla.
Nʼebe ndị mmadụ nọ,
ọṅụ alala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.