Juel 1:8
Joel 1:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kwaa akwa mwute dịka nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, nke di na-aga ịlụ ya nwụrụ.
Joel 1:8 in English
Joel 1:8 · Berean Standard Bible
Wail like a virgin dressed in sackcloth, grieving for the husband of her youth.
Context
6O nwere mba bịakwasịrị ala m,
usuu ndị agha nke na-enweghị ịgụta ọnụ;
nke nwere eze dịka ọdụm,
nweekwa ikiri eze dịka ka nne ọdụm. 7Ọ laala mkpụrụ vaịnị m nʼiyi
mee ka osisi fiig m niile mebie kpamkpam.
O kpechapụsịala agbụgbọ osisi fiig m,
kpofuo ha,
hapụ alaka osisi ya ka ọ na-acha ọcha. 8Kwaa akwa mwute dịka nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,
nke di na-aga ịlụ ya nwụrụ. 9Akwụsịla iwebata onyinye ọka na onyinye mmanya
nʼụlọ Onyenwe anyị.
Ndị nchụaja na-eru ụjụ,
bụ ndị ahụ na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị. 10Emebiela ala ubi niile,
ala nọ na-eru ụjụ.
Ebibiela ọka niile,
mmanya adịghịkwa,
otu a kwa, mmanụ oliv adịghịkwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.