Juel 1:7
Joel 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ laala mkpụrụ vaịnị m nʼiyi mee ka osisi fiig m niile mebie kpamkpam. O kpechapụsịala agbụgbọ osisi fiig m, kpofuo ha, hapụ alaka osisi ya ka ọ na-acha ọcha.
Joel 1:7 in English
Joel 1:7 · Berean Standard Bible
It has laid waste My grapevine and splintered My fig tree. It has stripped off the bark and thrown it away; the branches have turned white.
Context
5Tetanụ, unu ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Kwaanụ akwa.
Kwaanụ akwa unu ndị na-aṅụ mmanya;
kwaanụ akwa nʼihi mmanya ọhụrụ,
nʼihi na e sitela nʼọnụ unu napụ unu mmanya unu na-aṅụ. 6O nwere mba bịakwasịrị ala m,
usuu ndị agha nke na-enweghị ịgụta ọnụ;
nke nwere eze dịka ọdụm,
nweekwa ikiri eze dịka ka nne ọdụm. 7Ọ laala mkpụrụ vaịnị m nʼiyi
mee ka osisi fiig m niile mebie kpamkpam.
O kpechapụsịala agbụgbọ osisi fiig m,
kpofuo ha,
hapụ alaka osisi ya ka ọ na-acha ọcha. 8Kwaa akwa mwute dịka nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,
nke di na-aga ịlụ ya nwụrụ. 9Akwụsịla iwebata onyinye ọka na onyinye mmanya
nʼụlọ Onyenwe anyị.
Ndị nchụaja na-eru ụjụ,
bụ ndị ahụ na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.