Juel 1:11
Joel 1:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Daanụ mba nʼobi unu, unu ndị ọrụ ubi, tienụ mkpu akwa, unu ndị ọrụ ubi vaịnị. Tienụ aka nʼobi nʼihi ọka wiiti na ọka balị, nʼihi na a laala owuwe ihe ubi nʼiyi.
Joel 1:11 in English
Joel 1:11 · Berean Standard Bible
Be dismayed, O farmers, wail, O vinedressers, over the wheat and barley, because the harvest of the field has perished.
Context
9Akwụsịla iwebata onyinye ọka na onyinye mmanya
nʼụlọ Onyenwe anyị.
Ndị nchụaja na-eru ụjụ,
bụ ndị ahụ na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị. 10Emebiela ala ubi niile,
ala nọ na-eru ụjụ.
Ebibiela ọka niile,
mmanya adịghịkwa,
otu a kwa, mmanụ oliv adịghịkwa. 11Daanụ mba nʼobi unu, unu ndị ọrụ ubi,
tienụ mkpu akwa, unu ndị ọrụ ubi vaịnị.
Tienụ aka nʼobi nʼihi ọka wiiti na ọka balị,
nʼihi na a laala owuwe ihe ubi nʼiyi. 12Osisi vaịnị anwụọla.
Osisi fiig akpọnwụọla.
Osisi pomegranet na osisi nkwụ, na osisi apụl akpọnwụọla.
Nʼezie, osisi niile akpọnwụọla.
Nʼebe ndị mmadụ nọ,
ọṅụ alala. 13Yikwasịnụ onwe unu akwa mkpe, unu ndị nchụaja; ruonụ ụjụ,
kwaanụ akwa, unu ndị na-eje ozi nʼebe ịchụ aja.
Bịanụ, yiri akwa mkpe nọ ọnọdụ abalị
unu ndị na-ejere Chineke m ozi
nʼihi na egbochiela onyinye ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ
ịbata nʼụlọ Chineke unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.