Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa, otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa.
Job 7:9 in English
Job 7:9 · Berean Standard Bible
As a cloud vanishes and is gone, so he who goes down to Sheol does not come back up.
Context
7O Chineke cheta na ndụ m bụ naanị otu nkuume;
anya m abụọ agaghị ahụkwa ọṅụ ọzọ. 8Anya na-ahụ m ugbu a agaghị ahụkwa m ọzọ;
unu ga-achọ m ma unu agaghị a hụ m ọzọ. 9Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa,
otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa. 10E, ọ naghị alọghachikwa nʼụlọ ya ọzọ;
ebe ya agaghị amakwa ya ọzọ. 11“Ya mere agaghị m emechi ọnụ;
aga m ekwupụta nʼihi ihe mgbu dị m nʼime mmụọ.
Aga m eme mkpesa nʼihi ihe ilu dị m nʼobi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.