Job 7:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E, ọ naghị alọghachikwa nʼụlọ ya ọzọ; ebe ya agaghị amakwa ya ọzọ.
Job 7:10 in English
Job 7:10 · Berean Standard Bible
He never returns to his house; his place remembers him no more.
Context
8Anya na-ahụ m ugbu a agaghị ahụkwa m ọzọ;
unu ga-achọ m ma unu agaghị a hụ m ọzọ. 9Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa,
otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa. 10E, ọ naghị alọghachikwa nʼụlọ ya ọzọ;
ebe ya agaghị amakwa ya ọzọ. 11“Ya mere agaghị m emechi ọnụ;
aga m ekwupụta nʼihi ihe mgbu dị m nʼime mmụọ.
Aga m eme mkpesa nʼihi ihe ilu dị m nʼobi. 12A bụ m oke osimiri, maọbụ anụ ukwu dị nʼogbu osimiri,
nke mere i ji eche m nche?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.