Job 41:4
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụ ka i were ya dịka ohu gị ogologo ndụ ya niile?
Job 41:4 in English
Job 41:4 · Berean Standard Bible
Will he make a covenant with you to take him as a slave for life?
Context
2Ị pụrụ ikenye eriri nʼimi ya
maọbụ were ngu igwe mapuo agba ya? 3Ọ ga-arịọ gị arịrịọ ka i meere ya ebere?
Ọ ga-eji olu dị nro gwa gị okwu? 4Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụ
ka i were ya dịka ohu gị ogologo ndụ ya niile? 5Ị ga-eji ya gwurie egwu dịka nnụnụ?
Maọbụ kee ya eriri nye ya ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọ gị? 6Ndị ahịa ha ga-eji ya zụọ ahịa?
Ha ga-eke ya nʼetiti ndị mgbereahịa?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.