Job 40:23
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụladị mgbe ebili mmiri na-ama, ọ dịghị atụ egwu; ọ na-anọ nwayọọ, nʼagbanyeghị na mmiri Jọdan na-asọpụta na-asọju ya nʼọnụ.
Job 40:23 in English
Job 40:23 · Berean Standard Bible
Though the river rages, Behemoth is unafraid; he remains secure, though the Jordan surges to his mouth.
Context
21Ọ na-edina nʼokpuru ahịhịa na-eto nʼakụkụ mmiri,
zookwa onwe ya nʼetiti ahịhịa riidi nʼapịtị. 22Ahịhịa lotus na-eji ndo ya kpuchie ya,
osisi pọpla nke dị nʼakụkụ mmiri gbara ya gburugburu. 23Ọ bụladị mgbe ebili mmiri na-ama, ọ dịghị atụ egwu;
ọ na-anọ nwayọọ, nʼagbanyeghị na mmiri Jọdan na-asọpụta na-asọju ya nʼọnụ. 24Onye pụrụ ijide ya mgbe ọ na-ele anya,
maọbụ were ọnya jide ya mapuo ya imi?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.