Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụwa na-ewere ụdịdị ya dịka ụrọ a kakwasịrị akara; ụdịdị ya na-egosipụta dịka uwe.

Job 38:14 in English

Job 38:14 · Berean Standard Bible

The earth takes shape like clay under a seal; its hills stand out like the folds of a garment.

Context

12“O nweela oge i nyere ụtụtụ iwu, maọbụ mee ka chi ọbụbọ maara ọnọdụ ya, 13ka o jide akụkụ niile nke ụwa aka ma site nʼụwa yọpụ ndị mmebi iwu? 14Ụwa na-ewere ụdịdị ya dịka ụrọ a kakwasịrị akara; ụdịdị ya na-egosipụta dịka uwe. 15A na-eme ka ndị na-emebi iwu ghara inwe ìhè, meekwa ka aka e weliri elu bụrụ nke a nyajiri. 16“I jeruola nʼisi iyi mmiri dị nʼosimiri, ka i jegharịala nʼebe miri emi nke ogbu mmiri?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.