Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼezie, Chineke adịghị aṅa ntị nʼarịrịọ efu ha; Onye pụrụ ime ihe niile a dịghị elebara ya anya.

Job 35:13 in English

Job 35:13 · Berean Standard Bible

Surely God does not listen to empty pleas, and the Almighty does not take note of it.

Context

11onye na-akụziri anyị ihe karịa ka ọ na-akụziri ụmụ anụ ọhịa nke ụwa, onye na-eme ka anyị bụrụ ndị maara ihe karịa ụmụ nnụnụ* nke igwe?’ 12Ọ dịghị azaghachi mgbe ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa, nʼihi ịnya isi nke ndị ajọ omume. 13Nʼezie, Chineke adịghị aṅa ntị nʼarịrịọ efu ha; Onye pụrụ ime ihe niile a dịghị elebara ya anya. 14Ma ya bụrụzie nke a ị na-ekwu, ọ ga-esi aṅaa gee ntị mgbe ị na-ekwu na ị dịghị ahụ ya anya, na i burula ikpe gị bịa nʼihu ya na ị ga-anọkwa na-eche ya! 15Ọzọ, nʼihi na iwe ya adịghị eweta ntaramahụhụ, nʼihi na ọ dịghị arịba ama ajọ omume ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.