Job 35:12
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị azaghachi mgbe ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa, nʼihi ịnya isi nke ndị ajọ omume.
Job 35:12 in English
Job 35:12 · Berean Standard Bible
There they cry out, but He does not answer, because of the pride of evil men.
Context
10Ma ọ dịghị onye na-asị, ‘Olee ebe Chineke onye kere m nọ,
onye na-enye abụ nʼime abalị, 11onye na-akụziri anyị ihe karịa ka ọ na-akụziri ụmụ anụ ọhịa nke ụwa,
onye na-eme ka anyị bụrụ ndị maara ihe karịa ụmụ nnụnụ* nke igwe?’ 12Ọ dịghị azaghachi mgbe ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa,
nʼihi ịnya isi nke ndị ajọ omume. 13Nʼezie, Chineke adịghị aṅa ntị nʼarịrịọ efu ha;
Onye pụrụ ime ihe niile a dịghị elebara ya anya. 14Ma ya bụrụzie nke a ị na-ekwu, ọ ga-esi aṅaa gee ntị
mgbe ị na-ekwu na ị dịghị ahụ ya anya,
na i burula ikpe gị bịa nʼihu ya
na ị ga-anọkwa na-eche ya!
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.