Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

nʼihi na ha sitere nʼiso ya wezuga onwe ha, ha enweghịkwa uche ilebanye anya nʼụzọ ya ọbụla.

Job 34:27 in English

Job 34:27 · Berean Standard Bible

because they turned aside from Him and had no regard for any of His ways.

Context

25Nʼihi na ọ na-agụkọ ọrụ ha niile, ọ na-achụpụ ha nʼabalị mee ka ha ghọọ ndị e gwepịara egwepịa. 26Nʼebe mmadụ niile ga-ahụ ha ka ọ na-ata ha ahụhụ nʼihi ajọ omume ha, 27nʼihi na ha sitere nʼiso ya wezuga onwe ha, ha enweghịkwa uche ilebanye anya nʼụzọ ya ọbụla. 28Ha mere ka iti mkpu akwa nke ndị ogbenye ruo ya ntị, nke mere na ọ nụrụ akwa ndị nọ na mkpa. 29Ma ọ bụrụ na ọ gba nkịtị, onye ga-ama ya ikpe? Ọ bụrụ na o zoo ihu ya, onye pụrụ ịhụ ya? Ma ya onwe ya na-achị isi nʼebe mmadụ na mba nọ,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.