Job 34:23
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị mkpa ọ dịịrị Chineke ịga nʼihu inyocha ụmụ mmadụ, nke mere na ha ga-abịa nʼihu ya maka ikpe ikpe.
Job 34:23 in English
Job 34:23 · Berean Standard Bible
For God need not examine a man further or have him approach for judgment.
Context
21“Anya ya na-elekwasị ụzọ niile nke ụmụ mmadụ;
ọ na-ahụkwa nzọ ụkwụ ha niile. 22Ọ dịghị ọchịchịrị dị, ọ dịghịkwa oke ọchịchịrị dị,
ebe ndị na-eme ajọ ihe pụrụ izo. 23Ọ dịghị mkpa ọ dịịrị Chineke ịga nʼihu inyocha ụmụ mmadụ,
nke mere na ha ga-abịa nʼihu ya maka ikpe ikpe. 24Na-ajụghị ajụjụ Chineke na-akụtu ndị a maara aha ha
ma were ndị ọzọ dochie nʼọnọdụ ha. 25Nʼihi na ọ na-agụkọ ọrụ ha niile,
ọ na-achụpụ ha nʼabalị mee ka ha ghọọ ndị e gwepịara egwepịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.