Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe ọ dị; ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi.

Job 28:18 in English

Job 28:18 · Berean Standard Bible

Coral and quartz are unworthy of mention; the price of wisdom is beyond rubies.

Context

16A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya, a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya, 17A gaghị eji ọlaedo maọbụ kristal tụnyere ya, maọbụ iji ejiji ọlaedo nweta ya. 18Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe ọ dị; ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi. 19A gaghị eji ọla topaazi nke Kush tụnyere ya; a pụghị iji ọlaedo a nụchara anụcha zụta ya. 20Olee ebe amamihe si abịa? Olee ebe nghọta bi?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.