Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume, ka ndị na-ebili imegide m dịrị ka ndị na-emebi iwu.

Job 27:7 in English

Job 27:7 · Berean Standard Bible

May my enemy be like the wicked and my opponent like the unjust.

Context

5Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi; ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m agọnarị izuoke m. 6Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya; o nwekwaghị mgbe obi m ga-ata m ụta ogologo ụbọchị niile nke ndụ m. 7“Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume, ka ndị na-ebili imegide m dịrị ka ndị na-emebi iwu. 8Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị Chineke nwere mgbe e bipụrụ ya, mgbe Chineke wepụrụ ndụ ya? 9Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa ya mgbe nsogbu dakwasịrị ya?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.