Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼike ya ka o ji kpalie oke osimiri; ọ bụ amamihe ya ka o ji tigbuo Rehab.

Job 26:12 in English

Job 26:12 · Berean Standard Bible

By His power He stirred * the sea; by His understanding He shattered Rahab.

Context

10O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri, ka ọ bụrụ oke dị nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. 11Ogidi niile nke eluigwe na-ama jijiji, tụọkwa oke egwu nʼihi ịba mba ya. 12Nʼike ya ka o ji kpalie oke osimiri; ọ bụ amamihe ya ka o ji tigbuo Rehab. 13Ọ bụ site na nkuume ya ka mbara eluigwe ji maa mma; aka ya dupuru agwọ na-agba ọsọ. 14Ihe ndị a bụ ọnụ ọnụ ọrụ aka ya;* lee ka o si dị nta bụ okwu ntakwu anyị na-anụ gbasara ya! Onye pụrụ ịghọtacha ịda ụda* nke ike ya?” 26:6 Maọbụ, Abadọn nʼasụsụ Hibru 26:9 Ọ na-ekpuchi ihu ocheeze nke ọnwa 26:14 Ihe ndị a bụ ụfọdụ nʼime ihe ọ na-eme 26:14 Egbe eluigwe nke ike

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.