Job 22:8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ eziokwu na ị bụ nwoke dị ike na onye nwere ala, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ bi nʼala ya,
Job 22:8 in English
Job 22:8 · Berean Standard Bible
while the land belonged to a mighty man, and a man of honor lived on it.
Context
6Ị naara ụmụnne gị ihe ebe nʼefu;
ị yipụrụ ndị mmadụ uwe ha gbawa ha ọtọ. 7I nyeghị ndị ike gwuru mmiri,
i nyeghịkwa ndị agụụ na-agụ ihe oriri. 8Ọ bụ eziokwu na ị bụ nwoke dị ike na onye nwere ala,
bụrụkwa onye a na-asọpụrụ bi nʼala ya, 9Ị na-agbaba ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, zipụ ha,
Ị na-anyaji ogwe aka nke ụmụ na-enweghị nna. 10Ọ bụ ya mere ọnya jiri gbaa gị gburugburu,
bụrụkwa ihe mbibi ji eyi gị egwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.