Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Chineke ọ na-abara gị mba na-ebo gị ebubo nʼihi na ị na-atụ egwu ya?

Job 22:4 in English

Job 22:4 · Berean Standard Bible

Is it for your reverence that He rebukes you and enters into judgment against you?

Context

2“Mmadụ ọ pụrụ ịbara Chineke uru? Ọ bụladị onye nwere uche ọ pụrụ ịbara Chineke uru? 3O nwere ọṅụ ọ ga-enye Onye pụrụ ime ihe niile ma a sị na ị bụ onye ezi omume? Uru gịnị ka ọ ga-enweta ma ọ bụrụ na ụzọ gị niile enweghị ịta ụta? 4“Chineke ọ na-abara gị mba na-ebo gị ebubo nʼihi na ị na-atụ egwu ya? 5Ọ bụ na mmebi iwu gị adịghị ukwuu? Mmehie gị o nwere ọgwụgwụ? 6Ị naara ụmụnne gị ihe ebe nʼefu; ị yipụrụ ndị mmadụ uwe ha gbawa ha ọtọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.