Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị ga-ekpe ekpere, ọ ga-azakwa gị ekpere gị, ị ga-emezukwa nkwa i kwere.

Job 22:27 in English

Job 22:27 · Berean Standard Bible

You will pray to Him, and He will hear you, and you will fulfill your vows.

Context

25Mgbe ahụ, Onye pụrụ ime ihe niile ga-abụrụ gị ọlaedo, bụkwara gị ọlaọcha kachasị mma. 26Nʼezie, mgbe ahụ kwa, ihe nke Onye pụrụ ime ihe niile ga-atọ mkpụrụobi gị ụtọ, ị ga-ewelikwa ihu gị nye Chineke. 27Ị ga-ekpe ekpere, ọ ga-azakwa gị ekpere gị, ị ga-emezukwa nkwa i kwere. 28Ihe i kpebiri ga-emezukwa, ìhè ga-amụkwasị nʼụzọ gị niile. 29Mgbe a na-eweda ndị mmadụ ala, ọ bụrụkwa na ị sị, ‘Bulienụ ha elu,’ mgbe ahụ ọ ga-azọpụta ndị e wedara nʼala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.