Job 22:21
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Doo onwe gị nʼokpuru Chineke ka gị na ya nọọ nʼudo, nʼụzọ dị otu a, ọganihu ga-abịara gị.
Job 22:21 in English
Job 22:21 · Berean Standard Bible
Reconcile now and be at peace with Him; thereby good will come to you.
Context
19Ndị ezi omume na-ahụ mbibi ndị dị otu a ma ṅụrịa;
ndị aka ha dị ọcha na-akwa ha emo sị: 20‘Nʼezie, e bibiela ndị iro anyị,
ọkụ erepịala akụnụba ha.’ 21“Doo onwe gị nʼokpuru Chineke ka gị na ya nọọ nʼudo,
nʼụzọ dị otu a, ọganihu ga-abịara gị. 22Gee ntị, nabata ndụmọdụ si ya nʼọnụ,
doo okwu ya niile nʼobi gị. 23Ọ bụrụ na ịlaghachikwute Onye pụrụ ime ihe niile, ọ ga-eweghachi gị nʼọnọdụ gị;
ọ bụrụ na iwezuga ihe mmebi iwu mee ka ọ dị anya site nʼebe ụlọ ikwu gị dị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.